The Gospel, Igbo, p. 21
Ozi oma, Igbo, p. 21
⇐ ⇒
Gara aga peeji nke Peeji na-esonụ
Nchekwa nke ebigh-ebi
O buru na ime njo echi n,abia-abia ma o bu n, onwa n, abia- abia, nkea o nwere ike ime ka i tufuo onyinye ndu ebigh-ebi? Akwukwo Nso si:
Akwukwo Nso si: O bu kwa n, ochicho a ka edoworo anyi nso site n iche aru Jisus Kraist n,iru Chineke dika aja nani otu mgbe. Onye- nchu -aja o bula neguzo kwa kwa-ubochi nefe ofufe niche kwa otu aja ndia n, iru Chineke otutu mgbe, bu aja nke napugh ichipu nmehie mgbe o bula, Ma onye ahu,mgbe o chereri otu aja n, iru Chineke n, ihi nmehie (nke echi gara-aga,nke ta na nke echi nabia-abia), O we nodu n, aka-nri Chineke mgbe nile….N, ihi na O sitewo n, iche Onwe-ya n,iru Chineke dika aja otu mgbe mee ka ndi anedo nso zuo oke mgbe nile. Ndi Hibru 10:10-12, 14
Dika edere n,akwukwo Nso,ke nmehie gi bu nke Jisus kwuru ugwo ya?
❏ Nmehie nile nke i mere n,oge gara-aga.
❏ Nmehie nile nke i mere n,oge gara-aga na nke i neme n,ubochi ta.
❏ Nmehie gi ebigh-ebi:nke gara-aga,nke ta na kwa nke echi n,abia-abia.
Dika ama-okwu siri kwuo, ugboro ole ka edeworo anyi nso site n, onwu Jisus Kraist?
❏ Otu ugboro n,izu.
❏ Otu ugboro n, onwa.
❏ Mgbe obula i kwuputara nmehie gi nke di ohuru ma yo mgbaghara maka ya.
❏ Ogwusiala otu ugbo.
NCHEKWA EBIGH-EBI: Nkpebi di oke mkpa n, onwu onye –nwe-anyi
Madu apugh itufu onyinye amara ndu ebigh-ebi site maka nmehie.O bu ihe kpatara Kraist jiri nwuo……ikwu ugwo nmehie anyi! O bu maka n, okwuru ugwo nmehie anyi ebigh-ebi-nke gara aga,nke taa na nke echi n,abia abia—-nkea mere O jiri nwe ike kwuo n, ikpe amagh-kwa gi……o bugh nani maka nmehie anyi mere n,oge gara aga,ma o bu nmehie nile anyi:nke gara aga,nke taa nakwa nke echi n,abia abia! I ju i kwe maka nkea bu i ju ozi oma n,onwe ya(nyogharia nsape 7-11).
⇐ ⇒
Gara aga peeji nke Peeji na-esonụ
Cover 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 n’azụ cover